Jump to content

Chinụa Achebe

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Chinua Achebe
Chinua Achebe na Buffalo n'afọ 2008
MúrúAlbert Chinụalụmọgụ Achebe
(1930-11-16) 16 Novemba 1930
Ogidi, Nigeria Protectorate
NwürüMaachị 21, 2013(2013-03-21) (aged 82)
Boston, Másáchusẹts, Njikota Obodo Amerika
OrüOnye édémédé akwukwọ

Chinụa Achebe (site n'aha a gụrụ ya Albert Chinụalụmọgụ Achebe; 16 Novemba 1930 – 21 Maachị 2013) bụ onye Igbo a mụrụ n'ụbọchị nke iri na isii n'ọnwa Novemba n'afọ 1930 n'obodo Ogidi nke dị n'ala Naijiria. Ọ bụ ya dere akwụkwọ a na-akpọ Things Fall Apart. E si n'akwụkwọ ahụ mara aha ya nke ukwuu n'ụwa nile.[1]

Ihe ndụ nke Achebe

Chinụa Achebe gara ụlọakwụkwọ nta nke ndị uka, gakwaa Government College n'Umuahia. Ọ mechara gakwaa mahadum nke Ibadan University of Ibadan, Ȯra Ọyọ (Oyo State) ebe ọ gụrụ asụsụ békè' site n'afọ 1948 ruo afọ 1953. Ka ọ gụchara akwụkwọ nke mahadum, ọ rụtụkwara ọrụ n'ụlọakwụkwọ dị iche iche nakwa n'ụlọọrụ mgbasa ozi. Site na 1958 ruo 1966, Chinụa Achebe bụ onye nhazi na-ahụ maka African Writers Series.

Mgbe Achebe dere Things Fall Apart, akwụkwo ahu rere nke ukwuu, mkpụrụ nde iri. A tụgharịkwaala akwụkwụ a n'olu asụsụ iri ise.

Chinụa Achebe rụkwara ọrụ onye diplomat n'ọchịchị nke Biafra site na 1967. Mana site na 1967 ruo 1981, ọ kụzikwara na mahadum dị iche iche n'ala Naijiria, ma bụrụkwa onye nhazi maka akwụkwọ edemede nke a na-akpọ Okike. N'afọ 1981, Chinụa Achebe sokwa na ndị bidoro Otu Ndi Odee Nke Naijiria, nke a na-akpọ Association of Nigerian Authors. Ọ rụkwara ọrụ onye isi were ruo 1986.

A bịa n'etiti Ndị Nka, yaa bụ ndị na-ede edemede nke Modern African Literature, ihe a na-akpọ Chinụa Achebe bụ Nna. N'afọ 2002 ka e nyere ya Peace Prize nke German Book Trade. A makwa Chinua Achebe dị ka onye na-enweghi onye e ji atụnyere ya maka ịmalite edemede n'asụsụ bekee' n'akụkụ ọdịda anyanwụ n'ala Afrịka.

Ọ luru nwanyi; aha nwunye ya bụrụ Christiana Chinwe Okoli.

Ihe Ndị O Dere

Things Fall Apart, Anchor trade paperback cover.

Novels

Short Stories

Poetry

Essays, Criticism and Political Commentary

Children's Books

Ihe ndị o mmeri

  • 1972 Commonwealth Poetry Prize
  • 1987 Nigerian National Merit Award
  • 2002 Peace Prize of the German Book Trade
  • 2007 Man Booker International Prize

Lee nke ozo

References

  1. Chinua Achebe, African Literary Titan, Dies at 82, The New York Times, 22 Maachị 2013, asụsụ békè, looked up on 25 Maachị 2016.