Jump to content

Chinụa Achebe: Ọdịiche dị n'etiti nyochagharị

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Content deleted Content added
Tschips (ṅkátá | mmetara)
m new key for Category:Ndị Igbo: "Achebe" using HotCat
Tschips (ṅkátá | mmetara)
Ahiri 55: Ahiri 55:


[[Òtù:Ndị Igbo|Achebe]]
[[Òtù:Ndị Igbo|Achebe]]
[[Òtù:Onye édémédé akwukwọ si-na Naigeria]]

Orübà nà ógè 18:24, 24 Maachị 2016

Chinua Achebe, September 25, 2008, Buffalo.

Chinụa Achebe (site n'aha a gụrụ ya Albert Chinụalụmọgụ Achebe; 16 Novemba 1930 – 21 Maachị 2013) bụ onye Igbo a mụrụ n'ụbọchị nke iri na isii n'ọnwa Novemba n'afọ 1930 n'obodo Ogidi nke dị n'ala Naijiria. Ọ bụ ya dere akwụkwọ a na-akpọ Things Fall Apart. E si n'akwụkwọ ahụ mara aha ya nke ukwuu n'ụwa nile.

Chinụa Achebe gara ụlọakwụkwọ nta nke ndị uka, gakwaa Government College n'Umuahia. Ọ mechara gakwaa mahadum nke Ibadan University of Ibadan, Ȯra Ọyọ (Oyo State) ebe ọ gụrụ asusu bekee site n'afọ 1948 ruo afọ 1953. Ka ọ gụchara akwụkwọ nke mahadum, ọ rụtụkwara ọrụ n'ụlọakwụkwọ dị iche iche nakwa n'ụlọọrụ mgbasa ozi. Site na 1958 ruo 1966, Chinụa Achebe bụ onye nhazi na-ahụ maka African Writers Series.

Mgbe Achebe dere Things Fall Apart, akwụkwo ahu rere nke ukwuu, mkpụrụ nde iri. A tụgharịkwaala akwụkwụ a n'olu asụsụ iri ise.

Chinụa Achebe rụkwara ọrụ onye diplomat n'ọchịchị nke Biafra site na 1967. Mana site na 1967 ruo 1981, ọ kụzikwara na mahadum dị iche iche n'ala Naijiria, ma bụrụkwa onye nhazi maka akwụkwọ edemede nke a na-akpọ Okike. N'afọ 1981, Chinụa Achebe sokwa na ndị bidoro Otu Ndi Odee Nke Naijiria, nke a na-akpọ Association of Nigerian Authors. Ọ rụkwara ọrụ onye isi were ruo 1986.

Things Fall Apart, Anchor trade paperback cover.

A bịa n'etiti Ndị Nka, yaa bụ ndị na-ede edemede nke Modern African Literature, ihe a na-akpọ Chinụa Achebe bụ Nna. N'afọ 2002 ka e nyere ya Peace Prize nke German Book Trade. A makwa Chinua Achebe dị ka onye na-enweghi onye e ji atụnyere ya maka ịmalite edemede n'asụsụ bekee' n'akụkụ ọdịda anyanwụ n'ala Afrịka.

Ihe Ndị O Dere

Novels

Short Stories

Poetry

Essays, Criticism and Political Commentary

Children's Books